1 Ihe E Mere 26:16
1 Chronicles 26:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Shupim na Hosa na-eche ọnụ ụzọ dị nʼọdịda anyanwụ ya na ọnụ ụzọ ama Shaleket nke dị nʼụzọ elu elu. Ndị nche na-esota ndị nche ibe ha.
1 Chronicles 26:16 in English
1 Chronicles 26:16 · Berean Standard Bible
The lots for the West Gate and the Shallecheth Gate on the ascending highway * fell to Shuppim and Hosah. There were guards stationed at every watch.
Context
14Site nʼife nza, Shelemaya ketara iche ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nche.
Zekaraya nwa ya, onye ndụmọdụ nwere uche, sitekwara nʼife nza keta iche ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ugwu, ya na ndị otu ya. 15Obed-Edọm na ndị otu ya na-eche ụzọ dị na ndịda. Ụmụ ya bụ ndị na-eche ụlọ ebe a na-achịkọta ihe. 16Shupim na Hosa na-eche ọnụ ụzọ dị nʼọdịda anyanwụ ya na ọnụ ụzọ ama Shaleket nke dị nʼụzọ elu elu.
Ndị nche na-esota ndị nche ibe ha. 17Ya mere, ọ bụ ndị Livayị isii na-eche nche nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ụbọchị niile.
Mmadụ anọ na-anọ nʼugwu,
anọ na ndịda,
abụọ nʼebe a na-achịkọbata ihe. 18Nʼogige nke dị nʼọdịda anyanwụ e nwere ndị nche anọ nʼụzọ, ndị nche abụọ ọzọ nʼime ogige nʼonwe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.