Native Bible

1 Chronicles 25:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọnụọgụgụ ha tinyere ụmụ nne ha ndị e nyere ọzụzụ nʼihe gbasara abụ, bụ ndị nwere nghọta nʼihe banyere abụ a na-abụku Onyenwe anyị, dị narị abụọ, na iri asatọ na asatọ (288).

1 Chronicles 25:7 in English

1 Chronicles 25:7 · Berean Standard Bible

Together with their relatives, who were all trained and skillful in the songs of the LORD, they numbered 288.

Context

5Ndị a niile bụ ụmụ Heman, onye bụ ọhụ ụzọ eze. Dịka nkwa Chineke kwere maka ibuli ya elu, Chineke nyere ya ụmụ ndị ikom iri na anọ, na ụmụ ndị inyom atọ. 6Ụmụ ndị ikom ndị a niile nọ nʼokpuru nna ha, maka ịbụ abụ nʼụlọ Onyenwe anyị na-eji ịkpọ ụbọ na une na iti ọla na-ada ụda, nʼihi ofufe ụlọ Chineke. Asaf, na Jedutun, na Heman nọkwa nʼokpuru nlekọta eze. 7Ọnụọgụgụ ha tinyere ụmụ nne ha ndị e nyere ọzụzụ nʼihe gbasara abụ, bụ ndị nwere nghọta nʼihe banyere abụ a na-abụku Onyenwe anyị, dị narị abụọ, na iri asatọ na asatọ (288). 8Ha ji ife nza kee ọrụ ha, ma onye ukwu ma onye nta nʼime ha, ndị nwere nghọta ma ndị a na-azụ azụ, nʼotu aka ahụ. 9Nza nke mbụ e fere mara Josef nwa Asaf, ya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12). Nke abụọ, Gedaliya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụnne ya. Ha niile dị iri na abụọ (12).

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.