1 Ihe E Mere 25:5
1 Chronicles 25:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị a niile bụ ụmụ Heman, onye bụ ọhụ ụzọ eze. Dịka nkwa Chineke kwere maka ibuli ya elu, Chineke nyere ya ụmụ ndị ikom iri na anọ, na ụmụ ndị inyom atọ.
1 Chronicles 25:5 in English
1 Chronicles 25:5 · Berean Standard Bible
All these sons of Heman the king’s seer were given him through the promises of God to exalt him, for God had given Heman fourteen sons and three daughters.
Context
3Ma nye Jedutun, ụmụ ndị ikom ya:
Gedaliya, Zeri, Jeshaya, Shimei, Hashabaya na Matitaia. Ha dị isii nʼọnụọgụgụ nọrọ nʼokpuru nna ha bụ Jedutun, onye na-ebu amụma, na-eji une na-enye Onyenwe anyị ekele na otuto. 4Ma nye Heman, ụmụ ndị ikom ya:
Bukaya, Matanaya, Uziel, Shubuel, Jerimot, Hananaya, Hanani, Eliata, Gidalti, Romamti-Eza, Joshbekasha, Maloti, Hotia, na Mahaziot. 5Ndị a niile bụ ụmụ Heman, onye bụ ọhụ ụzọ eze. Dịka nkwa Chineke kwere maka ibuli ya elu, Chineke nyere ya ụmụ ndị ikom iri na anọ, na ụmụ ndị inyom atọ. 6Ụmụ ndị ikom ndị a niile nọ nʼokpuru nna ha, maka ịbụ abụ nʼụlọ Onyenwe anyị na-eji ịkpọ ụbọ na une na iti ọla na-ada ụda, nʼihi ofufe ụlọ Chineke.
Asaf, na Jedutun, na Heman nọkwa nʼokpuru nlekọta eze. 7Ọnụọgụgụ ha tinyere ụmụ nne ha ndị e nyere ọzụzụ nʼihe gbasara abụ, bụ ndị nwere nghọta nʼihe banyere abụ a na-abụku Onyenwe anyị, dị narị abụọ, na iri asatọ na asatọ (288).
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.