1 Ihe E Mere 23:22
1 Chronicles 23:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Elieza nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ndị ikom. Ọ bụ naanị ụmụ ndị inyom ka ọ mụtara. Ụmụ nwanne nna ha, ụmụ ndị ikom Kish, lụrụ ha.
1 Chronicles 23:22 in English
1 Chronicles 23:22 · Berean Standard Bible
Eleazar died without having any sons; he had only daughters. Their cousins, the sons of Kish, married them.
Context
20Ụmụ ndị ikom Uziel bụ
Maịka, onye mbụ, na Ishaya, onye nke abụọ. 21Ụmụ ndị ikom Merari bụ
Mahali na Mushi
Ụmụ ndị ikom Mali bụ
Elieza na Kish 22Elieza nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ndị ikom. Ọ bụ naanị ụmụ ndị inyom ka ọ mụtara. Ụmụ nwanne nna ha, ụmụ ndị ikom Kish, lụrụ ha. 23Ụmụ ndị ikom Mushi bụ
Mahali, Eda na Jeremot. Ha dị ndị ikom atọ. 24Ndị a bụ ụmụ ụmụ Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị, ndịisi ezi, dịka e si debanye aha, na dịka e si gụọ ha ọnụ nʼotu nʼotu, ya bụ ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị gbara iri afọ abụọ gbagoo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.