1 Ihe E Mere 23:12
1 Chronicles 23:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ ndị ikom Kohat bụ Amram, Izha, Hebrọn na Uziel. Ha dị ndị ikom anọ.
1 Chronicles 23:12 in English
1 Chronicles 23:12 · Berean Standard Bible
The sons of Kohath: Amram, Izhar, Hebron, and Uzziel—four in all.
Context
10Ụmụ Shimei bụ,
Jahat, Ziza,* Jeush na Beriya.
Ha dị ndị ikom anọ. 11Jahat bụ onye mbụ, Ziza onye nke abụọ. Ma Jeush na Beriya amụtaghị ọtụtụ ụmụ ndị ikom. Nʼihi ya, a gụnyekọtara ha dịka otu ezinaụlọ, kenye ha otu ọrụ. 12Ụmụ ndị ikom Kohat bụ
Amram, Izha, Hebrọn na Uziel. Ha dị ndị ikom anọ. 13Ụmụ ndị ikom Amram bụ,
Erọn na Mosis.
Erọn ka e kewapụrụ iche, ido ya nsọ ya na ụmụ ya ruo ebighị ebi, maka ido ihe niile kachasị nsọ nsọ, ịchụ aja nʼihu Onyenwe anyị, ije ozi nʼihu ya nakwa ikwupụta ngọzị nʼaha ya ruo ebighị ebi. 14Ụmụ Mosis, onye nke Chineke ka a gụnyekọtara dịka ndị si nʼebo Livayị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.