1 Ihe E Mere 22:12
1 Chronicles 22:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị nyekwa gị amamihe na nghọta nke ị ga-eji chịa ezi ọchịchị mgbe ị ghọrọ eze Izrel, ka i si otu a debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị.
1 Chronicles 22:12 in English
1 Chronicles 22:12 · Berean Standard Bible
Above all, may the LORD give you insight and understanding when He puts you in command over Israel, so that you may keep the Law of the LORD your God.
Context
10Ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ ahụ. Ọ ga-abụrụ m nwa, mụ onwe m ga-abụkwara ya nna. Aga m emekwa ka ocheeze alaeze ya nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.’ 11“Ya mere, ugbu a nwa m, ka Onyenwe anyị nọnyere gị mgbe ị ga-ewu ụlọ Onyenwe anyị Chineke gị, dịka o kwuru na ị ga-eme. 12Onyenwe anyị nyekwa gị amamihe na nghọta nke ị ga-eji chịa ezi ọchịchị mgbe ị ghọrọ eze Izrel, ka i si otu a debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị. 13Mgbe ahụ, ị ga-enwe ọganihu, ma ọ bụrụ na i lezie anya idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị nyere Mosis maka Izrel. Dị ike, nwee obi ike. Atụla ụjọ, maọbụ daa mba. 14“Ejisiela m ike chịkọtaa ihe maka ụlọnsọ Onyenwe anyị, narị puku talenti ọlaedo na nde talenti ọlaọcha, na igwe, na bronz, nke a na-apụghị ịgụta ịdị arọ ha, na osisi, na nkume. I nwere ike itinyekwa ihe ndị ọzọ nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.