1 Ihe E Mere 22:10
1 Chronicles 22:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ ahụ. Ọ ga-abụrụ m nwa, mụ onwe m ga-abụkwara ya nna. Aga m emekwa ka ocheeze alaeze ya nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.’
1 Chronicles 22:10 in English
1 Chronicles 22:10 · Berean Standard Bible
He is the one who will build a house for My Name. He will be My son, and I will be his Father. And I will establish the throne of his kingdom over Israel forever.’
Context
8ma okwu Onyenwe anyị ndị a ruru m ntị sị m, ‘Ị wụsịala ọtụtụ ọbara, bukwaa ọtụtụ agha. Ị gaghị ewu ụlọ nye Aha m, nʼihi na ị wụsịala ọtụtụ ọbara nʼelu ala nʼihu m. 9Ma ị ga-amụta otu nwa nwoke onye ga-abụ mmadụ udo, na onye ga-enwe izuike nʼoge ya. Aga m enye ya izuike site nʼaka ndị iro ya nʼakụkụ niile. Aha ya ga-abụ Solomọn. Aga m enye Izrel udo na ahụ dị jụụ nʼoge ọchịchị ya. 10Ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ ahụ. Ọ ga-abụrụ m nwa, mụ onwe m ga-abụkwara ya nna. Aga m emekwa ka ocheeze alaeze ya nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.’ 11“Ya mere, ugbu a nwa m, ka Onyenwe anyị nọnyere gị mgbe ị ga-ewu ụlọ Onyenwe anyị Chineke gị, dịka o kwuru na ị ga-eme. 12Onyenwe anyị nyekwa gị amamihe na nghọta nke ị ga-eji chịa ezi ọchịchị mgbe ị ghọrọ eze Izrel, ka i si otu a debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.