1 Ihe E Mere 22:14
1 Chronicles 22:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ejisiela m ike chịkọtaa ihe maka ụlọnsọ Onyenwe anyị, narị puku talenti ọlaedo na nde talenti ọlaọcha, na igwe, na bronz, nke a na-apụghị ịgụta ịdị arọ ha, na osisi, na nkume. I nwere ike itinyekwa ihe ndị ọzọ nʼime ha.
1 Chronicles 22:14 in English
1 Chronicles 22:14 · Berean Standard Bible
Now behold, I have taken great pains to provide for the house of the LORD—100,000 talents of gold,* 1,000,000 talents of silver,* and bronze and iron too great to be weighed. I have also provided timber and stone, and you may add to them.
Context
12Onyenwe anyị nyekwa gị amamihe na nghọta nke ị ga-eji chịa ezi ọchịchị mgbe ị ghọrọ eze Izrel, ka i si otu a debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị. 13Mgbe ahụ, ị ga-enwe ọganihu, ma ọ bụrụ na i lezie anya idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị nyere Mosis maka Izrel. Dị ike, nwee obi ike. Atụla ụjọ, maọbụ daa mba. 14“Ejisiela m ike chịkọtaa ihe maka ụlọnsọ Onyenwe anyị, narị puku talenti ọlaedo na nde talenti ọlaọcha, na igwe, na bronz, nke a na-apụghị ịgụta ịdị arọ ha, na osisi, na nkume. I nwere ike itinyekwa ihe ndị ọzọ nʼime ha. 15Lee, i nwekwara ọtụtụ ndị ọrụ ndị na-awa nkume, na ndị na-edo nkume, na ndị ọka osisi, na ndị a maara aha ha nʼihe gbasara ǹka nʼọrụ dị iche iche, 16ọlaedo, na ọlaọcha, na bronz, na igwe, ndị ọrụ nʼenweghị ọnụọgụgụ. Onyenwe anyị aghaghị ịnọnyere gị. Bilie, rụọ ọrụ dịịrị gị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.