1 Ihe E Mere 21:12
1 Chronicles 21:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Oke ụnwụ nke ga-adị afọ atọ, ka ọ bụ ọnwa atọ nke mkpochapụ nʼihu ndị iro unu, site na mma agha ha ga-eru unu ahụ, ka ọ bụ ụbọchị atọ nke mma agha Onyenwe anyị, bụ ajọ ọrịa na-efe efe ịda nʼala a, nke mmụọ ozi Onyenwe anyị ga-eme ka ọ bịakwasị ala Izrel niile. Ugbu a, chee echiche, kpebie ọsịsa ị chọrọ ka m weghachiri onye ahụ zitere m.”
1 Chronicles 21:12 in English
1 Chronicles 21:12 · Berean Standard Bible
between three years of famine, three months of being swept away * before your enemies and overtaken by their swords, or three days of the sword of the LORD—days of plague upon the land, with the angel of the LORD ravaging every part of Israel.’ Now then, decide how I should reply to Him who sent me.”
Context
10“Gaa gwa Devid, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ụzọ ihe atọ ka m na-eche gị nʼihu. Họrọ otu nʼime ha nke m ga-eme ka ọ bịakwasị gị.’ ” 11Ya mere Gad jekwuuru Devid sị ya, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, Họrọ nke dị gị mma. 12Oke ụnwụ nke ga-adị afọ atọ, ka ọ bụ ọnwa atọ nke mkpochapụ nʼihu ndị iro unu, site na mma agha ha ga-eru unu ahụ, ka ọ bụ ụbọchị atọ nke mma agha Onyenwe anyị, bụ ajọ ọrịa na-efe efe ịda nʼala a, nke mmụọ ozi Onyenwe anyị ga-eme ka ọ bịakwasị ala Izrel niile. Ugbu a, chee echiche, kpebie ọsịsa ị chọrọ ka m weghachiri onye ahụ zitere m.” 13Devid sịrị Gad, “Anọ m nʼoke nsogbu. Ọ ka mma ka m daba nʼaka Onyenwe anyị karịa ịdaba nʼaka mmadụ. Nʼihi na obi ebere ya bara ụba nke ukwuu.” 14Nʼihi ya, Onyenwe anyị zitere ajọ ọrịa na-efe efe nʼala Izrel, iri puku ndị ikom asaa dara nwụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.