1 Ihe E Mere 21:11
1 Chronicles 21:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere Gad jekwuuru Devid sị ya, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, Họrọ nke dị gị mma.
1 Chronicles 21:11 in English
1 Chronicles 21:11 · Berean Standard Bible
So Gad went and said to David, “This is what the LORD says: ‘You must choose
Context
9Onyenwe anyị gwara Gad, onye ọhụ ụzọ Devid, sị, 10“Gaa gwa Devid, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ụzọ ihe atọ ka m na-eche gị nʼihu. Họrọ otu nʼime ha nke m ga-eme ka ọ bịakwasị gị.’ ” 11Ya mere Gad jekwuuru Devid sị ya, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, Họrọ nke dị gị mma. 12Oke ụnwụ nke ga-adị afọ atọ, ka ọ bụ ọnwa atọ nke mkpochapụ nʼihu ndị iro unu, site na mma agha ha ga-eru unu ahụ, ka ọ bụ ụbọchị atọ nke mma agha Onyenwe anyị, bụ ajọ ọrịa na-efe efe ịda nʼala a, nke mmụọ ozi Onyenwe anyị ga-eme ka ọ bịakwasị ala Izrel niile. Ugbu a, chee echiche, kpebie ọsịsa ị chọrọ ka m weghachiri onye ahụ zitere m.” 13Devid sịrị Gad, “Anọ m nʼoke nsogbu. Ọ ka mma ka m daba nʼaka Onyenwe anyị karịa ịdaba nʼaka mmadụ. Nʼihi na obi ebere ya bara ụba nke ukwuu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.