1 Ihe E Mere 20:7
1 Chronicles 20:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọ kọchara Izrel, Jonatan nwa Shimea, nwanne Devid gburu ya.
1 Chronicles 20:7 in English
1 Chronicles 20:7 · Berean Standard Bible
and when he taunted Israel, Jonathan the son of David’s brother Shimei killed him.
Context
5Nʼagha ọzọ ha na ndị Filistia lụrụ, Elhanan, nwa Jaịa, gburu Lami nwanne Golaịat, onye Gat. Onye ùbe ya nwere osisi dị ogologo dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa. 6Nʼagha ọzọkwa, bụ nke a lụrụ na Gat, e nwere otu nwoke gbara oke dimkpa, nke nwere mkpịsịaka isii nʼaka ya ọbụla, nweekwa mkpịsịụkwụ isii nʼụkwụ ya ọbụla, ya bụ, a gụkọtaa ha niile, iri mkpịsịaka na mkpịsịụkwụ abụọ na anọ. Ọ bụkwa onye amụrụ nʼagbụrụ Rafa. 7Mgbe ọ kọchara Izrel, Jonatan nwa Shimea, nwanne Devid gburu ya. 8Ndị a bụ ndị agbụrụ Rafa dị na Gat. Devid na ndị agha ya gburu ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.