1 Ihe E Mere 20:5
1 Chronicles 20:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼagha ọzọ ha na ndị Filistia lụrụ, Elhanan, nwa Jaịa, gburu Lami nwanne Golaịat, onye Gat. Onye ùbe ya nwere osisi dị ogologo dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa.
1 Chronicles 20:5 in English
1 Chronicles 20:5 · Berean Standard Bible
Once again there was a battle with the Philistines, and Elhanan son of Jair killed Lahmi the brother * of Goliath the Gittite, the shaft of whose spear was like a weaver’s beam.
Context
3Ọ kpọpụtara ndị nọ nʼebe ahụ, manye ha nʼịrụ ọrụ nke e ji mma nkwọ e ji awa osisi, na igwe e ji egwu ala, na anyụike na-arụ. Otu a ka Devid mekwara obodo niile nke ndị Amọn. Emesịa, Devid na ndị agha ya niile laghachiri na Jerusalem. 4Mgbe oge gatụrụ, agha ọzọ daara ha na ndị Filistia, na Gaza. Mgbe ahụ, Sibekai, onye Husha, gburu Sipai, otu nʼime ndị agbụrụ Refaim. Nke a mere ka ndị Filistia chilie aka ha elu, bụrụ ndị a lụgburu nʼagha. 5Nʼagha ọzọ ha na ndị Filistia lụrụ, Elhanan, nwa Jaịa, gburu Lami nwanne Golaịat, onye Gat. Onye ùbe ya nwere osisi dị ogologo dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa. 6Nʼagha ọzọkwa, bụ nke a lụrụ na Gat, e nwere otu nwoke gbara oke dimkpa, nke nwere mkpịsịaka isii nʼaka ya ọbụla, nweekwa mkpịsịụkwụ isii nʼụkwụ ya ọbụla, ya bụ, a gụkọtaa ha niile, iri mkpịsịaka na mkpịsịụkwụ abụọ na anọ. Ọ bụkwa onye amụrụ nʼagbụrụ Rafa. 7Mgbe ọ kọchara Izrel, Jonatan nwa Shimea, nwanne Devid gburu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.