Native Bible

1 Chronicles 19:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ihe ndị a gasịrị, Nahash eze ndị Amọn nwụrụ, nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

1 Chronicles 19:1 in English

1 Chronicles 19:1 · Berean Standard Bible

Some time later, Nahash king of the Ammonites died and was succeeded by his son.

Context

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Nahash eze ndị Amọn nwụrụ, nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 2Mgbe ahụ, Devid chere sị, “Aga m egosi Hanọn nwa Nahash obi ebere nʼihi na nna ya gosiri m obi ebere.” Ya mere, Devid zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kasịe ya obi nʼihi ọnwụ nna ya. Mgbe ndị ozi Devid bịakwutere Hanọn nʼala ndị Amọn ịkasị ya obi, 3ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn, bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na ndị ozi ya abịakwuteghị gị, naanị ka ha mee nledo, nyochapụta otu obodo a dị ma kwatuo ya?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.