Native Bible

1 Chronicles 19:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn, bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na ndị ozi ya abịakwuteghị gị, naanị ka ha mee nledo, nyochapụta otu obodo a dị ma kwatuo ya?”

1 Chronicles 19:3 in English

1 Chronicles 19:3 · Berean Standard Bible

the princes of the Ammonites said to Hanun, “Just because David has sent you comforters, do you really believe he is showing respect for your father? Have not his servants come to you to explore the land, spy it out, and overthrow it?”

Context

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Nahash eze ndị Amọn nwụrụ, nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 2Mgbe ahụ, Devid chere sị, “Aga m egosi Hanọn nwa Nahash obi ebere nʼihi na nna ya gosiri m obi ebere.” Ya mere, Devid zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kasịe ya obi nʼihi ọnwụ nna ya. Mgbe ndị ozi Devid bịakwutere Hanọn nʼala ndị Amọn ịkasị ya obi, 3ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn, bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na ndị ozi ya abịakwuteghị gị, naanị ka ha mee nledo, nyochapụta otu obodo a dị ma kwatuo ya?” 4Nʼihi nke a, Hanọn jidere ndị ozi Devid nʼike, kpụchapụ ha ajị, bipụkwa uwe mwụda ha nʼetiti ike ha, zilaga ha. 5Mgbe otu onye bịara zie Devid ihe banyere ndị ikom ahụ, o zipụrụ ndị ozi, ka ha gaa zute ha, nʼihi na e mere ha ihe ihere nʼebe ọ dị ukwuu. Eze sịrị, “Nọdụnụ na Jeriko tutu ruo mgbe afụọnụ unu tolitere, mgbe ahụ unu ga-alọta.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.