Native Bible

1 Chronicles 19:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi nke a, Hanọn jidere ndị ozi Devid nʼike, kpụchapụ ha ajị, bipụkwa uwe mwụda ha nʼetiti ike ha, zilaga ha.

1 Chronicles 19:4 in English

1 Chronicles 19:4 · Berean Standard Bible

So Hanun took David’s servants, shaved their beards, cut off their garments at the hips, and sent them away.

Context

2Mgbe ahụ, Devid chere sị, “Aga m egosi Hanọn nwa Nahash obi ebere nʼihi na nna ya gosiri m obi ebere.” Ya mere, Devid zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kasịe ya obi nʼihi ọnwụ nna ya. Mgbe ndị ozi Devid bịakwutere Hanọn nʼala ndị Amọn ịkasị ya obi, 3ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn, bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na ndị ozi ya abịakwuteghị gị, naanị ka ha mee nledo, nyochapụta otu obodo a dị ma kwatuo ya?” 4Nʼihi nke a, Hanọn jidere ndị ozi Devid nʼike, kpụchapụ ha ajị, bipụkwa uwe mwụda ha nʼetiti ike ha, zilaga ha. 5Mgbe otu onye bịara zie Devid ihe banyere ndị ikom ahụ, o zipụrụ ndị ozi, ka ha gaa zute ha, nʼihi na e mere ha ihe ihere nʼebe ọ dị ukwuu. Eze sịrị, “Nọdụnụ na Jeriko tutu ruo mgbe afụọnụ unu tolitere, mgbe ahụ unu ga-alọta.” 6Ma mgbe ndị Amọn chọpụtara na ha abụrụla ihe ịsọ oyi nʼebe Devid nọ, Hanọn na ndị Amọn zipụrụ otu puku talenti ọlaọcha iji gbazite ụgbọ agha na ndị na-agba ụgbọ agha site na Aram Naharaim, na Aram Maaka, nakwa Zoba.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.