1 Ihe E Mere 14:12
1 Chronicles 14:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị Filistia hapụrụ chi niile ha nʼebe ahụ, Devid nyere iwu ka e suo ha niile ọkụ.
1 Chronicles 14:12 in English
1 Chronicles 14:12 · Berean Standard Bible
There the Philistines abandoned their gods, and David ordered that they be burned in the fire.
Context
10Devid jụrụ Chineke ase sị, “Ọ bụ m gaa buso ndị Filistia agha? Ị ga-enyefe ha nʼaka m?”
Onyenwe anyị zara sị ya, “Gaa, aga m enyefe ha nʼaka gị.” 11Ya mere, Devid na ndị ikom ya gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “Chineke enupula megide ndị iro m site nʼaka m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal Perazim. 12Ndị Filistia hapụrụ chi niile ha nʼebe ahụ, Devid nyere iwu ka e suo ha niile ọkụ. 13Ndị Filistia bukwara agha bịa na ndagwurugwu ahụ ọzọ. 14Nʼihi nke a, Devid jụrụ Chineke ase ọzọ. Chineke sịrị ya, “Esitekwala nʼihu buso ha agha, kama gbaa ha gburugburu, buso ha agha na ncherita ihu osisi balsam ndị ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.