Native Bible

Zechariah 8:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Okporoụzọ nke obodo ahụ niile ga-ejupụtakwa nʼụmụntakịrị ndị nwoke na ndị nwanyị na-egwugharị egwu na ama ebe ahụ.”

Zechariah 8:5 in English

Zechariah 8:5 · Berean Standard Bible

And the streets of the city will be filled with boys and girls playing there.”

Context

3Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Aga m alọghachi na Zayọn, bịa biri na Jerusalem. Mgbe ahụ, a ga-akpọ Jerusalem, obodo Eziokwu. A ga-akpọkwa ugwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile Ugwu Nsọ.” 4Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Agadi ndị ikom na agadi ndị inyom ga-anọdụkwa ala ọzọ na mbara ụzọ niile nke Jerusalem, onye ọbụla ga-ejidekwa mkpara nʼaka ya* nʼihi ọnụọgụgụ afọ ha gbara. 5Okporoụzọ nke obodo ahụ niile ga-ejupụtakwa nʼụmụntakịrị ndị nwoke na ndị nwanyị na-egwugharị egwu na ama ebe ahụ.” 6Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “O nwere ike bụrụ na ihe ndị a ga-adị ka ihe dịkarịrị ike imezu nʼanya ndị ahụ ga-afọdụ nʼoge ahụ, ma ọ ga-abụ ihe dịkarịrị ike ime nʼanya m?” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. 7Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Aga m azọpụta ndị m site na mba niile dị nʼọwụwa anyanwụ na nʼọdịda anyanwụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.