Zekaraya 8:7
Zechariah 8:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Aga m azọpụta ndị m site na mba niile dị nʼọwụwa anyanwụ na nʼọdịda anyanwụ.
Zechariah 8:7 in English
Zechariah 8:7 · Berean Standard Bible
This is what the LORD of Hosts says: “I will save My people from the land of the east and from the land of the west.
Context
5Okporoụzọ nke obodo ahụ niile ga-ejupụtakwa nʼụmụntakịrị ndị nwoke na ndị nwanyị na-egwugharị egwu na ama ebe ahụ.” 6Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “O nwere ike bụrụ na ihe ndị a ga-adị ka ihe dịkarịrị ike imezu nʼanya ndị ahụ ga-afọdụ nʼoge ahụ, ma ọ ga-abụ ihe dịkarịrị ike ime nʼanya m?” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. 7Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Aga m azọpụta ndị m site na mba niile dị nʼọwụwa anyanwụ na nʼọdịda anyanwụ. 8Aga m akpọghachitekwa ha, mee ka ha biri na Jerusalem. Ha ga-abụkwa ndị m, mụ onwe m ga-abụ Chineke ha, onye ezi omume na onye kwesiri ntụkwasị obi.” 9Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “Ka aka unu sie ike,* ka enwe ike wuo ụlọnsọ a, unu ndị na-anụ ugbu a otu okwu ahụ, nke ndị amụma kwuru mgbe a tọrọ ntọala iwugharị ụlọnsọ m, bụ ụlọ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.