Native Bible

Zechariah 7:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Gwanụ ndị nchụaja na ndị niile bi nʼala a, ‘Mgbe unu na-ebu ọnụ nʼọnwa nke ise ọbụla, na nʼọnwa nke asaa ọbụla, iri afọ asaa ndị a niile gara aga, ọ bụ mụ ka unu na-eburu ọnụ?

Zechariah 7:5 in English

Zechariah 7:5 · Berean Standard Bible

“Ask all the people of the land and the priests, ‘When you fasted and mourned in the fifth and seventh months for these seventy years, was it really for Me that you fasted?

Context

3ka ọ jụkwaa ndị nchụaja nọ nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ndị amụma, sị, “Ọ bụ m ruo ụjụ, bukwaa ọnụ nʼọnwa nke ise, dịka m si eme kemgbe ọtụtụ afọ ndị a gara aga?” 4Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị, 5“Gwanụ ndị nchụaja na ndị niile bi nʼala a, ‘Mgbe unu na-ebu ọnụ nʼọnwa nke ise ọbụla, na nʼọnwa nke asaa ọbụla, iri afọ asaa ndị a niile gara aga, ọ bụ mụ ka unu na-eburu ọnụ? 6Mgbe unu na-eri na-aṅụkwa, ọ bụ na unu anaghị eme ya maka nʼihi onwe unu? 7Ihe ndị a ha ọ bụghị okwu niile Onyenwe anyị kpọsara site nʼọnụ ndị amụma mbụ, mgbe Jerusalem na obodo niile dị ya gburugburu nọ nʼudo* nwekwa ọganihu, nʼoge ndị mmadụ bi na Negev, ya na ala ndịda ugwu niile?’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.