Native Bible

Zechariah 7:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ka ọ jụkwaa ndị nchụaja nọ nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ndị amụma, sị, “Ọ bụ m ruo ụjụ, bukwaa ọnụ nʼọnwa nke ise, dịka m si eme kemgbe ọtụtụ afọ ndị a gara aga?”

Zechariah 7:3 in English

Zechariah 7:3 · Berean Standard Bible

by asking the priests of the house of the LORD of Hosts, as well as the prophets, “Should I weep and fast in the fifth month, as I have done these many years?”

Context

1Nʼafọ nke anọ nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu nke Onyenwe anyị ruru Zekaraya ntị nʼụbọchị nke anọ, nʼọnwa nke itoolu, nke bụ ọnwa Kislev. 2Nʼoge a, ndị bi nʼobodo Betel ezitela Shareza, na Regem Melek, ha na ndị ọzọ ka ha bịa rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ, 3ka ọ jụkwaa ndị nchụaja nọ nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ndị amụma, sị, “Ọ bụ m ruo ụjụ, bukwaa ọnụ nʼọnwa nke ise, dịka m si eme kemgbe ọtụtụ afọ ndị a gara aga?” 4Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị, 5“Gwanụ ndị nchụaja na ndị niile bi nʼala a, ‘Mgbe unu na-ebu ọnụ nʼọnwa nke ise ọbụla, na nʼọnwa nke asaa ọbụla, iri afọ asaa ndị a niile gara aga, ọ bụ mụ ka unu na-eburu ọnụ?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.