Zekaraya 6:13
Zechariah 6:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ ya ga-arụ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. A ga-eyikwasịkwa ya ịma mma dịka uwe, ọ ga-anọdụ nʼocheeze ya na-achị. Ọ ga-abụ onye nchụaja ga-anọ nʼocheeze ya, mee ka ịdị nʼotu dịrị nʼetiti ha abụọ.’
Zechariah 6:13 in English
Zechariah 6:13 · Berean Standard Bible
Yes, He will build the temple of the LORD; He will be clothed in splendor and will sit on His throne and rule. And He will be a priest on His throne,* and there will be peaceful counsel between the two.’
Context
11Jiri ọlaọcha na ọlaedo ahụ kpụọ otu okpueze, were ya kpukwasị Joshua nwa Jehozadak bụ onyeisi nchụaja nʼisi. 12Gwa ya na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nke a bụ nwoke ahụ aha ya bụ Ngalaba. Ọ ga-esi nʼebe nke ya wapụta wuo ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. 13Ọ bụ ya ga-arụ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. A ga-eyikwasịkwa ya ịma mma dịka uwe, ọ ga-anọdụ nʼocheeze ya na-achị. Ọ ga-abụ onye nchụaja ga-anọ nʼocheeze ya, mee ka ịdị nʼotu dịrị nʼetiti ha abụọ.’ 14Okpueze ahụ ka a ga-enye Heldaya, Tobaija, Jedaya na Hen, nwa Zefanaya, ka ọ bụrụ ihe ncheta nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. 15Ndị nọ nʼebe dị anya ga-esi ebe ahụ bịa nye aka nʼọrụ iwu ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. Unu ga-amatakwa na ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m ịbịakwute unu. Ihe ndị a niile ga-eme ma ọ bụrụ na unu akpachapụ anya rubere Onyenwe anyị Chineke unu isi.”
6:5 Maọbụ, ikuku
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.