Zekaraya 6:12
Zechariah 6:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gwa ya na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nke a bụ nwoke ahụ aha ya bụ Ngalaba. Ọ ga-esi nʼebe nke ya wapụta wuo ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
Zechariah 6:12 in English
Zechariah 6:12 · Berean Standard Bible
And you are to tell him that this is what the LORD of Hosts says: ‘Here is a man whose name is the Branch, and He will branch out from His place and build the temple of the LORD.
Context
10“Gaa nata Heldai, Tobaija na Jedaya, ndị a dọtara nʼagha si Babilọn lọta ọlaọcha na ọlaedo. Nʼotu ụbọchị ahụ, gakwaa nʼụlọ Josaya nwa Zefanaya. 11Jiri ọlaọcha na ọlaedo ahụ kpụọ otu okpueze, were ya kpukwasị Joshua nwa Jehozadak bụ onyeisi nchụaja nʼisi. 12Gwa ya na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nke a bụ nwoke ahụ aha ya bụ Ngalaba. Ọ ga-esi nʼebe nke ya wapụta wuo ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. 13Ọ bụ ya ga-arụ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị. A ga-eyikwasịkwa ya ịma mma dịka uwe, ọ ga-anọdụ nʼocheeze ya na-achị. Ọ ga-abụ onye nchụaja ga-anọ nʼocheeze ya, mee ka ịdị nʼotu dịrị nʼetiti ha abụọ.’ 14Okpueze ahụ ka a ga-enye Heldaya, Tobaija, Jedaya na Hen, nwa Zefanaya, ka ọ bụrụ ihe ncheta nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.