Native Bible

Zechariah 3:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, o gosiri m Joshua onyeisi nchụaja ka ọ na-eguzo nʼihu mmụọ ozi nke Onyenwe anyị, na ekwensu ka ọ na-eguzo nʼaka nri ya ibo ya ebubo.

Zechariah 3:1 in English

Zechariah 3:1 · Berean Standard Bible

Then the angel showed me Joshua the high priest standing before the angel * of the LORD, with Satan * standing at his right hand to accuse him.

Context

1Mgbe ahụ, o gosiri m Joshua onyeisi nchụaja ka ọ na-eguzo nʼihu mmụọ ozi nke Onyenwe anyị, na ekwensu ka ọ na-eguzo nʼaka nri ya ibo ya ebubo. 2Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “Onyenwe anyị basiere gị mba ike, gị ekwensu. Onyenwe anyị, onye họpụtara Jerusalem, basiere gị mba ike. Nwoke a, ọ bụghị ọlọkọ ọkụ na-ere ere, nke e si nʼime ọkụ gụpụta?” 3Mgbe Joshua guzo nʼihu mmụọ ozi ahụ, uwe ya ruru unyi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.