Zekaraya 2:7
Zechariah 2:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Bịanụ, unu ndị bi na Zayọn. Gbalaganụ, unu ndị bi nʼala nke ada Babilọn.”
Zechariah 2:7 in English
Zechariah 2:7 · Berean Standard Bible
“Get up, O Zion! Escape, you who dwell with the Daughter of Babylon!”
Context
5Ma mụ onwe m ga-abụrụ ya mgbidi ọkụ nke ga-agba ya gburugburu.’ Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘Aga m aghọ ebube nʼetiti ya.’ 6“Bịa, lee anya! Sitenụ nʼala dị nʼugwu gbapụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “nʼihi na achụsasịrị m unu nye ikuku anọ nke eluigwe,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 7“Bịanụ, unu ndị bi na Zayọn. Gbalaganụ, unu ndị bi nʼala nke ada Babilọn.” 8Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Mgbe Onye ahụ dị ebube zipụrụ m ịga megide mba ndị ahụ niile kwakọọrọ ihe unu. Nʼihi na onye ọbụla metụrụ unu aka bụ mkpụrụ anya m ka ọ na-emetụ aka. 9Aghaghị m iweli aka m imegide ha, meekwa ka ndị ohu ha kwakọrọ ihe niile ha nwere. Mgbe ahụ, unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zitere m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.