Zekaraya 2:6
Zechariah 2:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Bịa, lee anya! Sitenụ nʼala dị nʼugwu gbapụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “nʼihi na achụsasịrị m unu nye ikuku anọ nke eluigwe,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Zechariah 2:6 in English
Zechariah 2:6 · Berean Standard Bible
“Get up! Get up! Flee from the land of the north,” declares the LORD, “for I have scattered you like the four winds of heaven,” declares the LORD.
Context
4ọ sịrị ya, “Gbaa ọsọ, gwa nwa okorobịa ahụ, sị, ‘Obodo na-enweghị mgbidi ka Jerusalem ga-abụ, nʼihi ọtụtụ igwe mmadụ na anụmanụ ga-ejupụta nʼime ya. 5Ma mụ onwe m ga-abụrụ ya mgbidi ọkụ nke ga-agba ya gburugburu.’ Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘Aga m aghọ ebube nʼetiti ya.’ 6“Bịa, lee anya! Sitenụ nʼala dị nʼugwu gbapụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “nʼihi na achụsasịrị m unu nye ikuku anọ nke eluigwe,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 7“Bịanụ, unu ndị bi na Zayọn. Gbalaganụ, unu ndị bi nʼala nke ada Babilọn.” 8Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Mgbe Onye ahụ dị ebube zipụrụ m ịga megide mba ndị ahụ niile kwakọọrọ ihe unu. Nʼihi na onye ọbụla metụrụ unu aka bụ mkpụrụ anya m ka ọ na-emetụ aka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.