Zekaraya 10:4
Zechariah 10:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-esi na Juda nweta nkume bụ ide ji ụlọ,* a ga-esi na ha nweta ǹtu ụlọ ikwu, a ga-esi na ha nweta ụta a kwadoro maka agha, sitekwa na ha nweta ndị ndu dị iche iche.
Zechariah 10:4 in English
Zechariah 10:4 · Berean Standard Bible
The cornerstone will come from Judah, the tent peg from him, as well as the battle bow and every ruler together.
Context
2Arụsị niile na-ekwu okwu aghụghọ,
ndị na-agba aja nʼahụ ọhụ bụ ụgha,
ndị ha na-arọ nrọ, na-akọwakwa nrọ ụgha,
okwu nkasiobi nke ihe na-adịghị nʼime ya ka ha na-enye.
Ya mere, ndị mmadụ na-akpagharị dịka atụrụ
a na-akpagbu ha nʼihi enweghị onye ọzụzụ atụrụ. 3“Iwe m na-ere ọkụ megide ndị ọzụzụ atụrụ,
aga m atakwa ndị ndu* niile ahụhụ;
nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
ga-elekọta igwe anụ ụlọ ya, ya bụ ndị Juda,
ọ ga-eme ka ha dịrị ka ịnyịnya dị ebube nʼagha. 4A ga-esi na Juda nweta nkume bụ ide ji ụlọ,*
a ga-esi na ha nweta ǹtu ụlọ ikwu,
a ga-esi na ha nweta ụta a kwadoro maka agha,
sitekwa na ha nweta ndị ndu dị iche iche. 5Ha niile ga-ejikọta onwe ha ọnụ, dịka ndị bụ dike nʼagha,
ha ga-azọda ndị iro ha nʼapịtị nke okporoụzọ niile.
Nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere ha,
ha ga-alụgbukwa ndị iro niile na-agba ịnyịnya. 6“Aga m eme ka ụlọ Juda dị ike,
zọpụtakwa ụlọ Josef.
Aga m eme ka ha lọghachita,
nʼihi na aga m egosi ha obi ebere.
Ha ga-adị
ka ndị m na-ajụghị mgbe ọbụla,
nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha,
aga m azakwa arịrịọ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.