Zekaraya 10:2
Zechariah 10:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Arụsị niile na-ekwu okwu aghụghọ, ndị na-agba aja nʼahụ ọhụ bụ ụgha, ndị ha na-arọ nrọ, na-akọwakwa nrọ ụgha, okwu nkasiobi nke ihe na-adịghị nʼime ya ka ha na-enye. Ya mere, ndị mmadụ na-akpagharị dịka atụrụ a na-akpagbu ha nʼihi enweghị onye ọzụzụ atụrụ.
Zechariah 10:2 in English
Zechariah 10:2 · Berean Standard Bible
For idols speak deceit and diviners see illusions; they tell false dreams and offer empty comfort. Therefore the people wander like sheep, oppressed for lack of a shepherd.
Context
1Rịọọnụ Onyenwe anyị mmiri ozuzo nʼoge mmiri ozuzo nke ikpeazụ,
nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-ezite oke amụma mmiri.
Ọ bụ ya na-enye ụmụ mmadụ mmiri ozuzo,
na-enyekwa mmadụ niile ihe ọkụkụ nke ubi. 2Arụsị niile na-ekwu okwu aghụghọ,
ndị na-agba aja nʼahụ ọhụ bụ ụgha,
ndị ha na-arọ nrọ, na-akọwakwa nrọ ụgha,
okwu nkasiobi nke ihe na-adịghị nʼime ya ka ha na-enye.
Ya mere, ndị mmadụ na-akpagharị dịka atụrụ
a na-akpagbu ha nʼihi enweghị onye ọzụzụ atụrụ. 3“Iwe m na-ere ọkụ megide ndị ọzụzụ atụrụ,
aga m atakwa ndị ndu* niile ahụhụ;
nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
ga-elekọta igwe anụ ụlọ ya, ya bụ ndị Juda,
ọ ga-eme ka ha dịrị ka ịnyịnya dị ebube nʼagha. 4A ga-esi na Juda nweta nkume bụ ide ji ụlọ,*
a ga-esi na ha nweta ǹtu ụlọ ikwu,
a ga-esi na ha nweta ụta a kwadoro maka agha,
sitekwa na ha nweta ndị ndu dị iche iche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.