Zekaraya 1:16
Zechariah 1:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eji obi ebere lọghachi na Jerusalem. Nʼebe ahụ kwa ka a ga-ewugharị ụlọnsọ ukwuu m. A ga-esetikwa eriri e ji atụ ihe nʼelu Jerusalem.’ Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
Zechariah 1:16 in English
Zechariah 1:16 · Berean Standard Bible
Therefore this is what the LORD says: ‘I will return to Jerusalem with mercy, and there My house will be rebuilt, declares the LORD of Hosts, and a measuring line will be stretched out over Jerusalem.’
Context
14Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nọ na-agwa m okwu gwara m sị, “Kwusaa ozi a, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru sị, ‘Ekworo m dị ukwuu nʼebe Jerusalem na Zayọn nọ, 15ma iwe m dị ukwuu megide ndị mba niile ahụ onwe ha juru afọ. Nʼihi na mgbe iwe m dị nta, ha nyere aka ime ka ahụhụ ahụ karịa njọ.’ 16“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eji obi ebere lọghachi na Jerusalem. Nʼebe ahụ kwa ka a ga-ewugharị ụlọnsọ ukwuu m. A ga-esetikwa eriri e ji atụ ihe nʼelu Jerusalem.’ Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. 17“Kwusaakwa ọzọ, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọganihu ga-adịkwa nʼobodo m niile ọzọ.* Onyenwe anyị ga-akasị Zayọn obi ọzọ, ma họpụtakwa Jerusalem.’ ” 18Mgbe ahụ, eweliri m anya m abụọ elu hụ mpi anọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.