Native Bible

Zechariah 1:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nọ na-agwa m okwu gwara m sị, “Kwusaa ozi a, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru sị, ‘Ekworo m dị ukwuu nʼebe Jerusalem na Zayọn nọ,

Zechariah 1:14 in English

Zechariah 1:14 · Berean Standard Bible

Then the angel who was speaking with me said, “Proclaim this word: This is what the LORD of Hosts says: ‘I am very jealous for Jerusalem and Zion,

Context

12Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị sịrị, “Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide hapụ imere Jerusalem na obodo niile nke Juda ebere, bụ obodo ị na-eweso iwe iri afọ asaa ndị a gara aga?” 13Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara mmụọ ozi ahụ guzo na-agwa m okwu, okwu nkasiobi na okwu ọma dị iche iche. 14Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nọ na-agwa m okwu gwara m sị, “Kwusaa ozi a, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru sị, ‘Ekworo m dị ukwuu nʼebe Jerusalem na Zayọn nọ, 15ma iwe m dị ukwuu megide ndị mba niile ahụ onwe ha juru afọ. Nʼihi na mgbe iwe m dị nta, ha nyere aka ime ka ahụhụ ahụ karịa njọ.’ 16“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eji obi ebere lọghachi na Jerusalem. Nʼebe ahụ kwa ka a ga-ewugharị ụlọnsọ ukwuu m. A ga-esetikwa eriri e ji atụ ihe nʼelu Jerusalem.’ Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.