Native Bible

Titus 3:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ọ dị mkpa ka ndị anyị mụta inyere ndị niile chọrọ enyemaka ha aka. Ọ bụ nke a ga-eme ka ha bụrụ ndị na-amị mkpụrụ.

Titus 3:14 in English

Titus 3:14 · Berean Standard Bible

And our people must also learn to devote themselves to good works in order to meet the pressing needs of others, so that they will not be unfruitful.

Context

12Ana m akwado izitere gị Atemas maọbụ Taịkikọs. Gbalịa bịakwute m na Nikopolis, maka nʼebe ahụ ka m kpebiri ịnọ nʼoge oyi. 13Gbaa mbọ zipụ Zenas bụ onye ọkaikpe, na Apọlọs, ngwangwa nʼije ha. Hụkwa na ha ji ihe niile dị ha mkpa. 14Nʼihi na ọ dị mkpa ka ndị anyị mụta inyere ndị niile chọrọ enyemaka ha aka. Ọ bụ nke a ga-eme ka ha bụrụ ndị na-amị mkpụrụ. 15Ndị niile mụ na ha nọ nʼebe a na-ekele gị. Kelekwara anyị ndị niile hụrụ anyị nʼanya nʼime okwukwe. Ka amara dịnyere unu niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.