Native Bible

Ruth 4:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Na mgbe ochie nʼala Izrel,* ime ka mgbapụta ihe na iwefe ihe site nʼaka baa nʼaka zuo oke, otu onye ga-eyipụ akpụkpọụkwụ* ya were ya nye onye nke ọzọ. Otu a ka e si ekpebi okwu gbasara orire na ọzụzụ, na-ime ka ihe ndị ọzọ guzosie ike nʼala Izrel.

Ruth 4:7 in English

Ruth 4:7 · Berean Standard Bible

Now in former times in Israel, concerning the redemption or exchange of property, to make any matter legally binding a man would remove his sandal and give it to the other party, and this was a confirmation in Israel.

Context

5Mgbe ahụ, Boaz sịrị, “Nʼụbọchị ị ga-azụrụ ala ahụ site nʼaka Naomi ka ị ga-enwetakwa Rut onye Moab bụ nwunye onye ahụ nwụrụ anwụ, ime ka aha onye ahụ nwụrụ anwụ na ihe nketa ya na-adịgide.” 6Na nke a, onye nchekwa mgbapụta ahụ sịrị, “Apụghị m ịgbapụta ya nʼihi na e nwere m ike itinye ihe nketa m na nsogbu. Gị onwe gị gbapụta ya. Nke a agaghị ekwe m omume.” 7Na mgbe ochie nʼala Izrel,* ime ka mgbapụta ihe na iwefe ihe site nʼaka baa nʼaka zuo oke, otu onye ga-eyipụ akpụkpọụkwụ* ya were ya nye onye nke ọzọ. Otu a ka e si ekpebi okwu gbasara orire na ọzụzụ, na-ime ka ihe ndị ọzọ guzosie ike nʼala Izrel. 8Nʼihi ya, mgbe nwoke ahụ gwara Boaz sị ya, “Zụrụ ala ahụ nʼonwe gị,” o yipụtara akpụkpọụkwụ ya. 9Mgbe ahụ, Boaz kwupụtara na ntị ndị okenye ndị ahụ na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ sị ha, “Unu bụ ndị akaebe na esitela m nʼaka Naomi zụrụ ala niile Elimelek, na Kilịọn na Mahlọn nwere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.