Native Bible

Ruth 4:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Boaz sịrị, “Nʼụbọchị ị ga-azụrụ ala ahụ site nʼaka Naomi ka ị ga-enwetakwa Rut onye Moab bụ nwunye onye ahụ nwụrụ anwụ, ime ka aha onye ahụ nwụrụ anwụ na ihe nketa ya na-adịgide.”

Ruth 4:5 in English

Ruth 4:5 · Berean Standard Bible

Then Boaz said, “On the day you buy the land from Naomi and also from Ruth the Moabitess, you must also acquire the widow of the deceased in order to raise up the name of the deceased on his inheritance.”

Context

3Mgbe ahụ, ọ gwara nwoke onye mgbapụta ahụ dị nso sị, “Naomi, onye si nʼala ndị Moab lọta, na-achọ ire ala nwanna anyị nwoke Elimelek. 4Ahụrụ m na o kwesiri ka m buru ụzọ gwa gị ka ị zụọ ya nʼihu ndị a nọ ọdụ nʼebe a, na nʼihu ndị okenye obodo anyị. Ọ bụrụ na ị ga-agbara ya, gwa m, ọ bụrụkwanụ na ị gaghị agbara ya, gwa m, ka m mara ihe m ga-eme. Nʼihi na ọ bụ gị ka ọ dịrị ịgbapụta ya. Mụ onwe m na-esote gị.” Ọ zara sị, “Aga m agbapụta ya.” 5Mgbe ahụ, Boaz sịrị, “Nʼụbọchị ị ga-azụrụ ala ahụ site nʼaka Naomi ka ị ga-enwetakwa Rut onye Moab bụ nwunye onye ahụ nwụrụ anwụ, ime ka aha onye ahụ nwụrụ anwụ na ihe nketa ya na-adịgide.” 6Na nke a, onye nchekwa mgbapụta ahụ sịrị, “Apụghị m ịgbapụta ya nʼihi na e nwere m ike itinye ihe nketa m na nsogbu. Gị onwe gị gbapụta ya. Nke a agaghị ekwe m omume.” 7Na mgbe ochie nʼala Izrel,* ime ka mgbapụta ihe na iwefe ihe site nʼaka baa nʼaka zuo oke, otu onye ga-eyipụ akpụkpọụkwụ* ya were ya nye onye nke ọzọ. Otu a ka e si ekpebi okwu gbasara orire na ọzụzụ, na-ime ka ihe ndị ọzọ guzosie ike nʼala Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.