Rut 1:21
Ruth 1:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aka m juru eju mgbe m si nʼebe a pụọ, ma Onyenwe anyị emeela ka m gbara aka lọta. Gịnị mere unu ji akpọ m Naomi ebe ọ bụ na Onyenwe anyị gbakụtara m azụ, ebe ọ bụ na Onye pụrụ ime ihe niile mere ka nsogbu dakwasị m.”
Ruth 1:21 in English
Ruth 1:21 · Berean Standard Bible
I went away full, but the LORD has brought me back empty. Why call me Naomi? After all, the LORD has testified against me, and the Almighty has afflicted me.”
Context
19Ya mere, ha abụọ gagidere ije rute Betlehem. Mgbe ha batara Betlehem, obodo ahụ mere mkpọtụ, nʼihi nlọta ha. Ndị inyom jụrụ sị, “Ọ bụ Naomi bụ nke a nʼezie?” 20Ma Naomi zara ha sị, “Unu akpọkwala m Naomi, kama kpọọnụ m Mara, nʼihi na Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka ndụ m jupụta nʼihe ilu. 21Aka m juru eju mgbe m si nʼebe a pụọ, ma Onyenwe anyị emeela ka m gbara aka lọta. Gịnị mere unu ji akpọ m Naomi ebe ọ bụ na Onyenwe anyị gbakụtara m azụ, ebe ọ bụ na Onye pụrụ ime ihe niile mere ka nsogbu dakwasị m.” 22Otu a ka Naomi na Rut onye Moab bụ nwunye nwa ya si laghachi nʼala Juda. Oge ha ji lọbata nʼobodo Betlehem bụ oge a na-amalite ịghọ ọka balị.*
1:2 Efrata bụ aha ezinaụlọ ebe Elimelek si pụta. Ọ bụ Elimelek gụrụ mpaghara ala ahụ dị nso Betlehem, Efrata. Mgbe ụfọdụ a na-akpọkwa ya Betlehem Efrata. Rut 4:11; Jen 35:19; 1Sa 17:12; Mai 5:2
1:8 Omenaala bụ na ndị ada na-alụbeghị di, na ndị ada di ha nwụrụ, na-ebinyere nne ha. Jen 24:28,67 Nʼakwụkwọ Rut isi abụọ, amaokwu nke iri na otu, e mere ka anyị mata na nna Rut ka dị ndụ.
1:11 Ajụjụ a bụ nʼihi omenaala ndị Juu, nke bụ, na nwanyị ọbụla na-amụtaghị nwa tupu di ya a nwụọ, na nwanne di ya ga-alụrụ ya. Jen 38:6-8; Dit 25:5-10
1:13 Nkp 2:15; Job 19:12; Abụ 38:2
1:22 Nʼoge owuwe ihe ubi, ọka balị bụ ihe ubi mbụ a na-eweta, mgbe izu ụka ole na ole gasịrị, ọ bụrụ oge owuwe ihe ubi wiiti. Rut 2:23; 2Sa 21:9
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.