Rut 1:19
Ruth 1:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ha abụọ gagidere ije rute Betlehem. Mgbe ha batara Betlehem, obodo ahụ mere mkpọtụ, nʼihi nlọta ha. Ndị inyom jụrụ sị, “Ọ bụ Naomi bụ nke a nʼezie?”
Ruth 1:19 in English
Ruth 1:19 · Berean Standard Bible
So Naomi and Ruth traveled until they came to Bethlehem. When they entered Bethlehem, the whole city was stirred because of them, and the women of the city exclaimed, “Can this be Naomi?”
Context
17ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ, ebe ahụ kwa ka a ga-eli m. Ka Onyenwe anyị mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m ekwere ka ihe ọzọ, ma ọ bụghị ọnwụ, kewaa mụ na gị.” 18Mgbe Naomi hụrụ na Rut ekpebiela nʼime onwe ya iso ya, ọ kwụsịrị ịgwa ya okwu ọzọ. 19Ya mere, ha abụọ gagidere ije rute Betlehem. Mgbe ha batara Betlehem, obodo ahụ mere mkpọtụ, nʼihi nlọta ha. Ndị inyom jụrụ sị, “Ọ bụ Naomi bụ nke a nʼezie?” 20Ma Naomi zara ha sị, “Unu akpọkwala m Naomi, kama kpọọnụ m Mara, nʼihi na Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka ndụ m jupụta nʼihe ilu. 21Aka m juru eju mgbe m si nʼebe a pụọ, ma Onyenwe anyị emeela ka m gbara aka lọta. Gịnị mere unu ji akpọ m Naomi ebe ọ bụ na Onyenwe anyị gbakụtara m azụ, ebe ọ bụ na Onye pụrụ ime ihe niile mere ka nsogbu dakwasị m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.