Rut 1:22
Ruth 1:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka Naomi na Rut onye Moab bụ nwunye nwa ya si laghachi nʼala Juda. Oge ha ji lọbata nʼobodo Betlehem bụ oge a na-amalite ịghọ ọka balị.* 1:2 Efrata bụ aha ezinaụlọ ebe Elimelek si pụta. Ọ bụ Elimelek gụrụ mpaghara ala ahụ dị nso Betlehem, Efrata. Mgbe ụfọdụ a na-akpọkwa ya Betlehem Efrata. Rut 4:11; Jen 35:19; 1Sa 17:12; Mai 5:2 1:8 Omenaala bụ na ndị ada na-alụbeghị di, na ndị ada di ha nwụrụ, na-ebinyere nne ha. Jen 24:28,67 Nʼakwụkwọ Rut isi abụọ, amaokwu nke iri na otu, e mere ka anyị mata na nna Rut ka dị ndụ. 1:11 Ajụjụ a bụ nʼihi omenaala ndị Juu, nke bụ, na nwanyị ọbụla na-amụtaghị nwa tupu di ya a nwụọ, na nwanne di ya ga-alụrụ ya. Jen 38:6-8; Dit 25:5-10 1:13 Nkp 2:15; Job 19:12; Abụ 38:2 1:22 Nʼoge owuwe ihe ubi, ọka balị bụ ihe ubi mbụ a na-eweta, mgbe izu ụka ole na ole gasịrị, ọ bụrụ oge owuwe ihe ubi wiiti. Rut 2:23; 2Sa 21:9
Ruth 1:22 in English
Ruth 1:22 · Berean Standard Bible
So Naomi returned from the land of Moab with her daughter-in-law Ruth the Moabitess. And they arrived in Bethlehem at the beginning of the barley harvest.
Context
20Ma Naomi zara ha sị, “Unu akpọkwala m Naomi, kama kpọọnụ m Mara, nʼihi na Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka ndụ m jupụta nʼihe ilu. 21Aka m juru eju mgbe m si nʼebe a pụọ, ma Onyenwe anyị emeela ka m gbara aka lọta. Gịnị mere unu ji akpọ m Naomi ebe ọ bụ na Onyenwe anyị gbakụtara m azụ, ebe ọ bụ na Onye pụrụ ime ihe niile mere ka nsogbu dakwasị m.” 22Otu a ka Naomi na Rut onye Moab bụ nwunye nwa ya si laghachi nʼala Juda. Oge ha ji lọbata nʼobodo Betlehem bụ oge a na-amalite ịghọ ọka balị.*
1:2 Efrata bụ aha ezinaụlọ ebe Elimelek si pụta. Ọ bụ Elimelek gụrụ mpaghara ala ahụ dị nso Betlehem, Efrata. Mgbe ụfọdụ a na-akpọkwa ya Betlehem Efrata. Rut 4:11; Jen 35:19; 1Sa 17:12; Mai 5:2
1:8 Omenaala bụ na ndị ada na-alụbeghị di, na ndị ada di ha nwụrụ, na-ebinyere nne ha. Jen 24:28,67 Nʼakwụkwọ Rut isi abụọ, amaokwu nke iri na otu, e mere ka anyị mata na nna Rut ka dị ndụ.
1:11 Ajụjụ a bụ nʼihi omenaala ndị Juu, nke bụ, na nwanyị ọbụla na-amụtaghị nwa tupu di ya a nwụọ, na nwanne di ya ga-alụrụ ya. Jen 38:6-8; Dit 25:5-10
1:13 Nkp 2:15; Job 19:12; Abụ 38:2
1:22 Nʼoge owuwe ihe ubi, ọka balị bụ ihe ubi mbụ a na-eweta, mgbe izu ụka ole na ole gasịrị, ọ bụrụ oge owuwe ihe ubi wiiti. Rut 2:23; 2Sa 21:9
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.