Native Bible

Romans 7:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼime ime onwe m, ọ na-agụ m agụụ ime ihe iwu Chineke kwuru.

Romans 7:22 in English

Romans 7:22 · Berean Standard Bible

For in my inner being I delight in God’s law.

Context

20Ọ bụrụ na m na-eme ihe ahụ m na-achọghị ime, ọ pụtara na ọ bụghị mụ onwe m na-eme ihe ndị ahụ. Kama ọ bụ mmehie bi nʼime m na-eme ha. 21Achọpụtara m iwu nke na-arụ ọrụ nʼime m. Mgbe m chọrọ ime ihe ọma, naanị ihe ọjọọ bụ ihe na-agara m aka ime. 22Nʼime ime onwe m, ọ na-agụ m agụụ ime ihe iwu Chineke kwuru. 23Ma ana m ahụta iwu ọzọ dị nʼime m nke na-agba mgba megide iwu nke dị nʼuche m, ime ka m bụrụ ohu nye iwu nke mmehie na-arụ ọrụ ya nʼanụ ahụ m. 24Lee ụdị ọnọdụ ọjọọ nke m hụtara onwe m nʼime ya! Onye pụrụ ịnapụta m site nʼanụ ahụ a nke na-eduba m nʼọnwụ?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.