Native Bible

Romans 7:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ọ pụtara na ihe ahụ dị mma wetaara m ọnwụ? Mba! Kama ọ bụ mmehie sitere nʼihe dị mma wetara m ọnwụ, ka e nwee ike gosipụta na mmehie bụ ihe jọgburu onwe ya site nʼihe e nyere nʼiwu.

Romans 7:13 in English

Romans 7:13 · Berean Standard Bible

Did that which is good, then, become death to me? Certainly not! But in order that sin might be exposed as sin, it produced death in me through what was good, so that through the commandment sin might become utterly sinful.

Context

11Nʼihi na mmehie jiri ohere ahụ iwu webatara ghọgbuo m, sitekwa nʼiwu ahụ gbuo m. 12Nʼezie, iwu ahụ dị nsọ, ihe e nyere nʼiwu dị nsọ, bụrụkwa ezi omume na ihe dị mma. 13Mgbe ahụ, ọ pụtara na ihe ahụ dị mma wetaara m ọnwụ? Mba! Kama ọ bụ mmehie sitere nʼihe dị mma wetara m ọnwụ, ka e nwee ike gosipụta na mmehie bụ ihe jọgburu onwe ya site nʼihe e nyere nʼiwu. 14Anyị matara na iwu bụ ihe nke mmụọ ebe mụ onwe m bụ anụ ahụ efu, onye e rere dịka ohu nye mmehie. 15O nweghị ụzọ ihe m na-eme si doo m anya. Nʼihi na ihe m na-eme abụghị ihe m chọrọ ime, ọ bụ ihe m kpọrọ asị bụ ihe na-agara m aka ime mgbe niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.