Native Bible

Romans 7:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Anyị matara na iwu bụ ihe nke mmụọ ebe mụ onwe m bụ anụ ahụ efu, onye e rere dịka ohu nye mmehie.

Romans 7:14 in English

Romans 7:14 · Berean Standard Bible

We know that the law is spiritual; but I am unspiritual, sold as a slave to sin.

Context

12Nʼezie, iwu ahụ dị nsọ, ihe e nyere nʼiwu dị nsọ, bụrụkwa ezi omume na ihe dị mma. 13Mgbe ahụ, ọ pụtara na ihe ahụ dị mma wetaara m ọnwụ? Mba! Kama ọ bụ mmehie sitere nʼihe dị mma wetara m ọnwụ, ka e nwee ike gosipụta na mmehie bụ ihe jọgburu onwe ya site nʼihe e nyere nʼiwu. 14Anyị matara na iwu bụ ihe nke mmụọ ebe mụ onwe m bụ anụ ahụ efu, onye e rere dịka ohu nye mmehie. 15O nweghị ụzọ ihe m na-eme si doo m anya. Nʼihi na ihe m na-eme abụghị ihe m chọrọ ime, ọ bụ ihe m kpọrọ asị bụ ihe na-agara m aka ime mgbe niile. 16Ma ọ bụrụ na m eme ihe m na-achọghị ime, ana m ekwenye na iwu dị mma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.