Ndị Rom 7:11
Romans 7:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na mmehie jiri ohere ahụ iwu webatara ghọgbuo m, sitekwa nʼiwu ahụ gbuo m.
Romans 7:11 in English
Romans 7:11 · Berean Standard Bible
For sin, seizing its opportunity through the commandment, deceived me and through the commandment put me to death.
Context
9Na mbụ, abụ m onye dị ndụ mgbe iwu na-adịghị, ma mgbe iwu bịara, e mere ka mmehie nwe ntute. 10Anwụrụ m, ma chọpụta na iwu ahụ kwesiri iwetara m ndụ ghọziri ihe wetara ọnwụ. 11Nʼihi na mmehie jiri ohere ahụ iwu webatara ghọgbuo m, sitekwa nʼiwu ahụ gbuo m. 12Nʼezie, iwu ahụ dị nsọ, ihe e nyere nʼiwu dị nsọ, bụrụkwa ezi omume na ihe dị mma. 13Mgbe ahụ, ọ pụtara na ihe ahụ dị mma wetaara m ọnwụ? Mba! Kama ọ bụ mmehie sitere nʼihe dị mma wetara m ọnwụ, ka e nwee ike gosipụta na mmehie bụ ihe jọgburu onwe ya site nʼihe e nyere nʼiwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.