Ndị Rom 4:8
Romans 4:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya.”*
Romans 4:8 in English
Romans 4:8 · Berean Standard Bible
Blessed is the man whose sin the Lord will never count against him.”*
Context
6Devid nʼonwe ya kwukwara banyere ọṅụ dịịrị onye ọbụla Chineke gụrụ nʼonye ezi omume nʼagbanyeghị ọrụ ya. 7“Ngọzị na-adịrị
ndị a gbaghaara ajọ omume ha niile,
ndị ekpuchikwara mmehie ha niile. 8Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ,
onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya.”* 9Ngọzị a ọ dịrị naanị ndị e biri ugwu ka ọ bụ nyekwa ndị a na-ebighị ugwu? Ihe anyị na-ekwu bụ na a gụrụ okwukwe Ebraham dị ka ezi omume nye ya. 10Olee mgbe a gụrụ ya nye ya? Ọ bụ tupu e bie ya ugwu, ka ọ bụ mgbe e bichara ya ugwu? Ọ bụghị mgbe e bichara ya ugwu kama ọ bụ tupu e bie ya ugwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.