Ndị Rom 4:20
Romans 4:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị mgbe ọbụla o nwere obi abụọ na Chineke agaghị emezu ihe niile o kwere ya na nkwa. Kama, okwukwe ya mere ka ọ gbasie ike, ka ọ na-enye Chineke otuto.
Romans 4:20 in English
Romans 4:20 · Berean Standard Bible
Yet he did not waver through disbelief in the promise of God, but was strengthened in his faith and gave glory to God,
Context
18Ọ bụladị mgbe olileanya gasịrị, o kwenyere na ya ga-abụ nna nke ọtụtụ mba, dịka ihe a gwara ya si dị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị.*”* 19Ọ daghị mba nʼokwukwe ọ bụladị mgbe ọ matara na ya akala nka nʼahụ, nʼihi na ọ gbaruola otu narị afọ, tinyekwara na akpanwa Sera bụ ihe nwụrụ anwụ. 20Ọ dịghị mgbe ọbụla o nwere obi abụọ na Chineke agaghị emezu ihe niile o kwere ya na nkwa. Kama, okwukwe ya mere ka ọ gbasie ike, ka ọ na-enye Chineke otuto. 21O nwere otu obi na Chineke pụrụ imezu ihe niile ọbụla o kwere na nkwa. 22Ọ bụ nʼihi ya ka e ji gụọ nke a nye ya dị ka ezi omume.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.