Native Bible

Romans 3:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Chineke ọ bụ naanị nke ndị Juu? Ọ bụkwaghị nke ndị mba ọzọ? Nʼezie, ọ bụkwa nke ndị mba ọzọ.

Romans 3:29 in English

Romans 3:29 · Berean Standard Bible

Is God the God of Jews only? Is He not the God of Gentiles too? Yes, of Gentiles too,

Context

27Mgbe o si otu a dịrị, olee ebe ịnya isi anyị dịkwa? Ajụla ịnabata ya. Ọ bụ site iwu dị aṅa? Ọ bụ nke ọrụ? Mba, kama ọ bụ site nʼokwukwe anyị nwere nʼime Kraịst. 28Ya mere, anyị na-agụnye mmadụ nʼonye ezi omume nʼihi okwukwe o nwere, ọ bụghị nʼihi na o mere ihe iwu kwuru. 29Chineke ọ bụ naanị nke ndị Juu? Ọ bụkwaghị nke ndị mba ọzọ? Nʼezie, ọ bụkwa nke ndị mba ọzọ. 30Nʼihi na Chineke dị naanị otu, ọ bụ site nʼokwukwe ka ọ ga-anabata ndị ahụ ebiri ugwu, sitekwa nʼotu okwukwe ahụ gụọ ndị a na-ebighị ugwu ka ndị ezi omume. 31Ọ bụrụ na ọ dị otu a, anyị na-esite nʼokwukwe anyị mee ka iwu ghara ịdị ire? Mba! Kama anyị na-enye iwu ọnọdụ kwesiri ya. 3:4 Abụ 51:4 3:12 Abụ 14:1-3; 53:1-3; Ekl 7:20 3:13 Abụ 5:9 3:13 Abụ 140:3 3:14 Abụ 10:7 3:17 Aịz 59:7,8 3:18 Abụ 36:1

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.