Ndị Rom 15:22
Romans 15:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie, nke a bụ ihe mere m na-ejibeghị nwee ohere ịbịakwute unu.
Romans 15:22 in English
Romans 15:22 · Berean Standard Bible
That is why I have often been hindered from coming to you.
Context
20Ọchịchọ obi m mgbe niile bụ ikwusa oziọma ahụ nʼebe ọbụla ndị mmadụ na-anụtụbeghị ihe banyere Kraịst, ka m ghara ịbụ onye na-ewukwasị ihe nʼelu ntọala nke onye ọzọ tọrọ, 21ma dịka e dere ya,
“Ndị a na-agwaghị ihe banyere ya ga-ahụ,
ndị a ka anụbeghị, ga-aghọtakwa.”* 22Nʼezie, nke a bụ ihe mere m na-ejibeghị nwee ohere ịbịakwute unu. 23Nʼihi na ọ dịla ọtụtụ afọ kemgbe m bidoro na-enwe mmasị m ga-abịa hụ unu anya, ma ugbu a, ọrụ m nwere nʼakụkụ a agwụla, oge eruola mgbe m ji ahapụ ebe a. 24Nʼihi na nzube m bụ ijeru obodo Spen. Mgbe ọbụla m ga-agakwa, aga m akwụsị ịhụ unu na elekwa anya na unu ga-edupụ m nʼije m, mgbe mụ na unu jiri ọṅụ nọrọtụ nwa mgbe nta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.