Ndị Rom 15:12
Romans 15:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọzọkwa, Aịzaya na-asị, “Mgbọrọgwụ Jesi ga-epulite ọzọ, onye nke ga-ebili ịchị mba niile, ndị mba ọzọ ga-enwekwa olileanya nʼime ya.”*
Romans 15:12 in English
Romans 15:12 · Berean Standard Bible
And once more, Isaiah says: “The Root of Jesse will appear, One who will arise to rule over the Gentiles; in Him the Gentiles will put their hope.”*
Context
10O kwukwara ọzọ sị,
“Soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ unu ndị mba ọzọ.”* 11Ọzọkwa,
“Toonu Onyenwe anyị unu ndị mba ọzọ niile,
ka ndị niile dị iche iche jaakwa ya mma.”* 12Ọzọkwa, Aịzaya na-asị,
“Mgbọrọgwụ Jesi ga-epulite ọzọ,
onye nke ga-ebili ịchị mba niile,
ndị mba ọzọ ga-enwekwa olileanya nʼime ya.”* 13Ka Chineke onye bụ isi olileanya mejupụta unu nʼoke ọṅụ na udo dịka unu na-atụkwasị ya obi, ka unu si otu a bụrụ ndị olileanya ha jubigara oke site nʼike nke Mmụọ Nsọ. 14Ụmụnna m, o doro m anya na unu onwe unu jupụtara nʼịdị mma, bụrụkwa ndị tozuru etozu nʼihe ọmụma ruo na unu nwere ike izirịta onwe unu ihe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.