Native Bible

Romans 10:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“maọbụ, ‘Onye ga-arịda nʼime ili?’ ”* (nke a bụ, ịkpọlite Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ).

Romans 10:7 in English

Romans 10:7 · Berean Standard Bible

or, ‘Who will descend into the Abyss?’* (that is, to bring Christ up from the dead).”

Context

5Mosis si otu a dee banyere ezi omume nke sitere nʼiwu, “Onye ọbụla na-eme ihe ndị a ga-adị ndụ site na ha.”* 6Ma ezi omume ahụ nke sitere nʼokwukwe na-asị, “Asịla nʼime obi gị, ‘onye ga-arịgo nʼime eluigwe?’ ”* (nke bụ, ikudata Kraịst) 7“maọbụ, ‘Onye ga-arịda nʼime ili?’ ”* (nke a bụ, ịkpọlite Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ). 8Ma gịnị ka ọ na-ekwu? “Okwu ahụ nọ gị nso, ọ dị nʼọnụ gị dịrịkwa nʼobi gị,”* ọ bụ ya, bụ okwu okwukwe ahụ anyị na-ekwusa. 9Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.