Native Bible

Romans 10:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma gịnị ka ọ na-ekwu? “Okwu ahụ nọ gị nso, ọ dị nʼọnụ gị dịrịkwa nʼobi gị,”* ọ bụ ya, bụ okwu okwukwe ahụ anyị na-ekwusa.

Romans 10:8 in English

Romans 10:8 · Berean Standard Bible

But what does it say? “The word is near you; it is in your mouth and in your heart,”* that is, the word of faith we are proclaiming:

Context

6Ma ezi omume ahụ nke sitere nʼokwukwe na-asị, “Asịla nʼime obi gị, ‘onye ga-arịgo nʼime eluigwe?’ ”* (nke bụ, ikudata Kraịst) 7“maọbụ, ‘Onye ga-arịda nʼime ili?’ ”* (nke a bụ, ịkpọlite Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ). 8Ma gịnị ka ọ na-ekwu? “Okwu ahụ nọ gị nso, ọ dị nʼọnụ gị dịrịkwa nʼobi gị,”* ọ bụ ya, bụ okwu okwukwe ahụ anyị na-ekwusa. 9Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị. 10Nʼihi na ọ bụ obi gị ka ị ga-eji kwere; a gụọ gị nʼonye ezi omume, ọ bụkwa ọnụ gị ka ị ga-eji kwupụta, a zọpụta gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.