Mkpughe 22:8
Revelation 22:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mụ onwe m bụ Jọn, hụrụ ihe ndị a niile, nụkwa ha. Mgbe m hụrụ ma nụchaa ihe ndị a niile, adara m nʼụkwụ mmụọ ozi a gosiri m ha ịkpọ isiala nye ya.
Revelation 22:8 in English
Revelation 22:8 · Berean Standard Bible
And I am John, who heard and saw these things. And when I had heard and seen them, I fell down to worship at the feet of the angel who had shown me these things.
Context
6Mmụọ ozi ahụ gwara m, “Okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu. Onyenwe anyị, bụ Chineke, onye na-enye ndị amụma Mmụọ ya ezitela mmụọ ozi ya igosi ụmụodibo ya ihe ndị ahụ ga-emezu nʼoge na-adịghị anya. 7“Lee, ana m abịa ọsịịsọ. Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-edebe okwu amụma ndị a dị nʼakwụkwọ a.” 8Mụ onwe m bụ Jọn, hụrụ ihe ndị a niile, nụkwa ha. Mgbe m hụrụ ma nụchaa ihe ndị a niile, adara m nʼụkwụ mmụọ ozi a gosiri m ha ịkpọ isiala nye ya. 9Ma ọ sịrị m, “Emela ihe dị otu ahụ! Mụ onwe m bụkwa odibo Jisọs dịka gị onwe gị, na dịka ụmụnna gị ndị amụma, na dịka ndị ahụ niile na-edebe okwu niile e dere nʼakwụkwọ a. Kpọọrọ Chineke isiala.” 10Ma ọ sịrị, “Akachila okwu amụma ndị a dị nʼakwụkwọ akara, nʼihi na oge adịla nso.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.