Mkpughe 22:10
Revelation 22:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ sịrị, “Akachila okwu amụma ndị a dị nʼakwụkwọ akara, nʼihi na oge adịla nso.
Revelation 22:10 in English
Revelation 22:10 · Berean Standard Bible
Then he told me, “Do not seal up the words of prophecy in this book, because the time is near.
Context
8Mụ onwe m bụ Jọn, hụrụ ihe ndị a niile, nụkwa ha. Mgbe m hụrụ ma nụchaa ihe ndị a niile, adara m nʼụkwụ mmụọ ozi a gosiri m ha ịkpọ isiala nye ya. 9Ma ọ sịrị m, “Emela ihe dị otu ahụ! Mụ onwe m bụkwa odibo Jisọs dịka gị onwe gị, na dịka ụmụnna gị ndị amụma, na dịka ndị ahụ niile na-edebe okwu niile e dere nʼakwụkwọ a. Kpọọrọ Chineke isiala.” 10Ma ọ sịrị, “Akachila okwu amụma ndị a dị nʼakwụkwọ akara, nʼihi na oge adịla nso. 11Ka ndị niile na-eme ajọ omume gaa nʼihu na-eme ajọ omume, ka ndị na-adịghị ọcha gaa nʼihu bụrụ ndị na-adịghị ọcha, ka ndị na-eme ezi ihe gaa nʼihu na-eme ezi ihe, ka ndị dị nsọ gaa nʼihu bụrụ ndị dị nsọ.” 12“Lee, ana m abịa ọsịịsọ! Ụgwọ ọrụ m ga-enye onye ọbụla dịka ọrụ ọ rụrụ si dị dịkwa m nʼaka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.