Mkpughe 2:9
Revelation 2:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Amaara m mkpagbu gị niile na ịda ogbenye gị. Ma nʼezie, ị bụ ọgaranya. Amaara m ihe banyere nkwutọ niile ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị Juu na-ekwutọ gị, ma ha abụghị ndị Juu, nʼezie ha bụ ụlọ nzukọ ekwensu.
Revelation 2:9 in English
Revelation 2:9 · Berean Standard Bible
I know your affliction and your poverty—though you are rich! And I am aware of the slander of those who falsely claim to be Jews, but are in fact a synagogue of Satan.
Context
7Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ. Onye ahụ na-emeri emeri ka m ga-enye ike iri mkpụrụ sitere nʼosisi ndụ ahụ nke dị na paradaịs nke Chineke. 8“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Smyrna, sị ya:
Ihe ndị a bụ okwu ahụ bụ Mmalite na Ọgwụgwụ ihe niile. Onye nwụrụ anwụ ma dịkwa ndụ ọzọ. 9Amaara m mkpagbu gị niile na ịda ogbenye gị. Ma nʼezie, ị bụ ọgaranya. Amaara m ihe banyere nkwutọ niile ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị Juu na-ekwutọ gị, ma ha abụghị ndị Juu, nʼezie ha bụ ụlọ nzukọ ekwensu. 10Atụkwala egwu nʼihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nʼihi na ekwensu nʼonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nʼime ndị gị nʼụlọ mkpọrọ, ka o jiri ya nwalee gị. A ga-akpagbu unu abalị iri. Ma gosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, ọ bụladị ruo mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, a ga m enye gị okpueze ahụ, bụ ndụ. 11Onye ọbụla nwere ntị ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Onye ọbụla na-emeri emeri, ọnwụ nke ugboro abụọ agaghị emekpa ya ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.