Mkpughe 2:10
Revelation 2:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Atụkwala egwu nʼihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nʼihi na ekwensu nʼonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nʼime ndị gị nʼụlọ mkpọrọ, ka o jiri ya nwalee gị. A ga-akpagbu unu abalị iri. Ma gosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, ọ bụladị ruo mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, a ga m enye gị okpueze ahụ, bụ ndụ.
Revelation 2:10 in English
Revelation 2:10 · Berean Standard Bible
Do not fear what you are about to suffer. Look, the devil is about to throw some of you into prison to test you, and you will suffer tribulation for ten days. Be faithful even unto death, and I will give you the crown of life.
Context
8“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Smyrna, sị ya:
Ihe ndị a bụ okwu ahụ bụ Mmalite na Ọgwụgwụ ihe niile. Onye nwụrụ anwụ ma dịkwa ndụ ọzọ. 9Amaara m mkpagbu gị niile na ịda ogbenye gị. Ma nʼezie, ị bụ ọgaranya. Amaara m ihe banyere nkwutọ niile ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị Juu na-ekwutọ gị, ma ha abụghị ndị Juu, nʼezie ha bụ ụlọ nzukọ ekwensu. 10Atụkwala egwu nʼihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nʼihi na ekwensu nʼonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nʼime ndị gị nʼụlọ mkpọrọ, ka o jiri ya nwalee gị. A ga-akpagbu unu abalị iri. Ma gosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, ọ bụladị ruo mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, a ga m enye gị okpueze ahụ, bụ ndụ. 11Onye ọbụla nwere ntị ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Onye ọbụla na-emeri emeri, ọnwụ nke ugboro abụọ agaghị emekpa ya ahụ. 12“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị Pegamọm, sị ya:
Ndị a bụ okwu si nʼọnụ onye ahụ ji mma agha ahụ dị nkọ nke nwere ihu abụọ nʼaka ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.